TUJAMSS Volume 10 Number 1 2026

E NWEGHI EZI ICHEKWAWA ỌDỊBENDỊ NA ỌDỊNALA: NTỌALA ỌDỊDA OMENALA NKE AGBỤRỤ (INSECURITY OF CUSTOM AND TRADITION: THE ROOT CAUSE OF THE COLAPSE THE CULTURE OF A RACE)

Rich. N. Ekegbo, PhD Nneke Charles, PhD
Abstract

Ọ dịla ezigbo mkpa ime nkọwa miri emi gbasara ndịiche dị n’ihe metụtara omenala, ọdịbendị, na ọdịnala, n’ihi na mkpụrụokwu atọ a na-enwe mgbagwojuanya. N’ihi na ọ bụrụ na e nweghi nkọwasị doro anya nke ọma, ụfọdụ ndị mmadụ nwereike na-ekwu otu n’ime ha atọ, ebe ihe ha na-akọ na-egosi otu n’ime abụọ ndị ọzọ, maọbụ na-akọwada akarangwa ndị e ji ama otu, ma na-eweta mgbagwojuanya abụọ ndị ọzọ. E nwereike ikwu ọtụtụ ihe gbasara ọdịbendị, ọdịnala, na omenala, mana ihe ndị a na-ekwu gbasara ha ọ dabara nke ọma? Ọ bụ ihe mwute na ndị ahụ kwesiri ịbụ ndị ga-echekwawa ọdịbendị, ọdịnala na omenala bụ ndị gba aka nke ihe ndị ahụ a chọrọ n’aka ha gbasara ihe ndị ahụ a na-atụ anya n’ala ha. N’oge ugbua ndị ọchịchị ọdịnala; ndị gụnyere ndị Igwe/Eze na ndị onowu, dị ka ndị Ọchịọha Obodo (President Generals), bụzi ndị ka wee bụrụ ndị ndọrọndọrọ n’ụdị ndị ọchịchị ofesi, karịa ịbụ ndị nchekwawa akụrụngwa ndị a e ji egosi agbụrụ ha. Ọ bụ ya kpatara atịkụl a ji bagide nchọcha gbasara ihe o ji esi ike ịghọta mkpụrụokwu atọ a bụ ọdịbendị, ọdịnala na omenala nke ọma; gbasakwara ihe o ji esi ike ichepụta uru dị ga n’ichekwawa akụrụngwa ndị a etu kwesiri ekwesi, sitekwa n’anaghị enwe nchekwawa ahụ na-emetọ ha etu ekwesighi ekwesi, maọbụ na-eweta ọdịda omenala Igbo. N’ihi ya, atịkụl a gbara mbọ igosi ndịiche dị n’ọdịbendị, ọdịnala na omenala, na-egosikwa mwute ọ dị ya ịhụ na taa, na ndị ọ dị n’aka ahapụla ime ka ihe ndị ahụ na-eto, n’ihi iri mperi nke ha, ma gosikwa egwu dị n’ileghara ha anya, nakwa ihe ụfọdụ a pụrụ ime iji kwa onye ukwu wara. Atịkụl a ji inyocha akwụkwọ dị iche iche were me nke a.

Keywords: Ọdịbendị, Ọdịnala, Omenala, Igbo, Agbụrụ.
Copyright © 2026 ACJOL.