Ngharịpụ bụ otu ihe mmadụ ọ bụla na-ahụ n’ụzọ ndụ ya nke e nweghị ike ịgbanarị. Ọ na-apụta ihe n’ụzọ dị iche iche; o nwere ike ịbụ mmadụ ịgharịpụ onye ọzọ maọbụ mmadụ ịgharịpụ onwe ya ma ọ bụkwanụ ọnọdụ ịgharịpụ mmadụ mana ka o sila dị, ngharịpụ n’ụzọ ọ bụla na-eweta mgbawaobi na obi ịjụ oyi nye onye agharịpụrụ. Nke a mere o ji dị njọ ime mmadụ. E nwekwara mgbe ngharịpụ na-atụgharị bụụrụ mmadụ ihe ọṅụ mana ọtụtụ mgbe. Ederede a na-eleba anya etu ndị odee agụmagụ ndị a si zipụta ngharịpụ n’akwụkwọ ha dị ka ihe wetara obi mgbawa nye ndị o metụtara. Ederede a gbadoro ụkwụ na usoro nkọwa ma were atụtụ ngharịpụ nke David Bell tụpụtara n’afọ 1985 wee tụchaa agụmagụ ndị a iji mee ka o doo anya. Nchọpụta gosịrị na mmadụ ịtụ anya ihe n’aka onye ọzọ maọbụ inwebiga ntụkwasị obi n’ebe onye ọzọ nọ ma ọ bụkwanụ ịche na onye ọ bụla ga na-emeso ya omume dị mma maka na ọ na-emeso ndị ọzọ ezi omume na-ebute ngharịpụ oge ụfọdụ. A hụkwara na ngharịpụ na-eweta obi mgbawa ma tinye mmadụ. Ederede a ga-enyere onye ọ bụla aka ịmata ọ dịghị mma mmadụ inwebiga ntụkwasiobi n’ebe onye ọzọ nọ. Ọzọ, atụla anya ihe ọ bụla n’aka mmadụ iji gbanarị ngharịpụ n’ikpeazụ nke na-ebute obi mgbawa.
Keywords: Agụmagụ, Ejije, Iduuazị, na Ngharịpụ