IGBOSCHOLARS Volume 19 Number 1 2026

MMETỤTA AKWAMOZU ỌDỊNAALA NYE AHỤIKE: IGBO ẸZAA DỊKA EBE NLERU ANYA

Ndụbụisi Joseph Nwanganga Goodluck Chigbo Nwode (Ph.D) Prof. Mercy Agha Onu Nworie Grace Amarachi
Abstract

Isi okwu nchọcha a bụ mmetụta akwamozu nye ahụike n’Igbo Ẹzaa. Mbunuche nchọcha a bụ ịmata etu akwamozu Ẹzaa si akwada ahụike ndị mmadụ. E bukwa n’uche isite na nke a tụpụta arọ ga-enye aka n’ịhazi usoro akwamozu na-agaghị emegide ahụike ndị mmadụ. Nchọcha a bụ nke nkọwa. Ndị nchọcha gbasoro abụmoke na agbata afọ sere mmadụ iri na ise Dịka ndị njiri-mee nchọcha a. E ji njụmaza, nleta nsonyere na mkparịta ụka nweta njatụle nke ọrụ a. Ya bụ, e ji ajụjụ abụọ mere ihe. Mbunuche ajụjụ abụọ ndị ahụ bụ ịmata emereme akwamozu nke na-emegide ahụike n’Ẹzaa nakwa ụzọ e nwere ike isi hazigharịa ha n’ụdị na-agaghịzị emekpa ahụike ndị mmadụ ahụ. A gbasoro atụtụ mmetụta ọdịmara tụchaa njatụle ndị e nwetara. N’ikpeazụ, a chọpụtara na akwamozu ọdịnaala Ẹzaa nwere ọtụtụ emereme na-emegide ahụike ndị mmadụ. Emereme ndị ahụ gụnnyere: ilifu ozu, ịnụ nri onyi ovu, ifuchi ẹka l’ọnụ, ịnyagharị ozu, iwebe ozu ẹkwa na okpu, ịhapụ ozu n’ụlọ ọtụtụ ụbọchị, ọnọdụ ịgba mkpe nke ụmụ nwaanyị, ikiri ozu na ime ẹkwa. A chọpụtakwara na ọ bụrụ na ndị nhazi na nchekwa omenaala, ndị isi ọchịchị obodo, ndị ọrụ ahụike nakwa ọhanaeze tinyekọ aka, a ga-enwe ike ịhazigharị ememere ndị ahụ n’ụdị ha agaghịzị enwe ihe mmekpa ahụ nye ahụike ndị mmadụ.

Keywords: akwamozu, ahụike na mmetụta ahụike
Copyright © 2026 ACJOL.