IDEAL Volume 16 Number 1 2023

MMEGBU NA NHAZI D?KA O SIRI MET?TA ND? IGBO NA NA?JIR?A

Joy Ifeadikanwa Obayi
Abstract

Nd? Igbo b? otu agb?r? d? n’ala Na?jir?a. Ha bi na mpaghara ?w?wa anyanw? Na?jir?a. Nd? Igbo b? mba gbasiri ike. Ha na-ad? uchu n’ihe niile ha na-eme. ? na-ad? ka ha na-ah?ta onwe ha na a na-emegbu ha emegbu n’obodo Na?jir?a n’otu e si eke oke, ya na ihe nd? ?z? gas?. Onye nch?cha ga-eme nleghar? ad?m were mee nch?cha a. Nch?cha ga-ab?kwa n’ak?k? Igbo niile ka a ga-eme ya iji nweta ?sa nye isiokwu a na-ekwu maka ya. Nch?cha ga-agba aj?j? ?n? nye mmad? ole na ole iji mata uche ha gbasara isiokwu a. A ga-eji aj?j? nch?cha ab?? na ?maokwu ab?? were mee nch?cha a. Nch?cha a ga-enye aka ime ka a mara ?n?d? nd? Igbo n? n’obodo Na?jir?a. ? gaenyekwa aka na nhazi nke e kwesiri ?hazi Na?jir?a ka obi were d? onye ? b?la mma, ka a ghara imegbukwa ak?k? ?f?d? na Na?jir?a. Nch?cha ga-ewere steeti ise b? nd? Igbo kp?m kwem mee nch?cha nke g?nyere Steeti Anambara, A b?a, Eb?nyi, Enugwu na Imo; ma serekwa mmad? iri at? na steeti ? b?la mee nch?cha. Nke p?tara ?n??g? mmad? nar? na iri ise. A ga-ejikwa miin na nd?pu izugbe hazie aj?maza ma werekwa t-teesti hazie ?maokwu. Nch?cha tuleghar?r? ?sa nch?cha ma ch?p?ta na a na-emegbu ?f?d? mpaghara d? na Na?jir?a ma nd? ah? b? nd? Igbo. A ch?p?tara na ? b? kamgbe a l?chara agha nke dap?tara na Na?jir?a ebe nd? Igbo na uf?d? nd? agbataobi ya ch?r? ka ha n?r? onwe ha ghara ?b?z? otu n’ime nd? Na?jir?a. Nch?cha kpok?tara nch?cha ya site n’ibunye uche ihe a ga-eme ka nhazi a nwee isi ka udo were laghachi az? n’obodo Na?jir?a. Igodo Okwu: Mmegbu, Nd? Igbo, ?n?d?, Uchu, na Nhazi

Keywords: d?ka, igbo, met?ta, mmegbu, na?jir?a, ndi, nhaz?, siri
Copyright © 2026 ACJOL.