IDEAL Volume 13 Number 2 2020

?ch? Mma d?ka Ngosip?ta Ntozuoke ?m?agb?gh? maka Al?mdi n’ala Igbo

Onyinye Anne Nwankwo, Ph.D.
Abstract

Tupu nwaany? al?? di, o kwesiri ?d? nkwadobe maka ihe ?mà aka d? n’al?mdi na nwunye. ? b? ?n?d? a mere nd? ?ch?cha jiri bagide nch?cha a iji k?wap?ta ?d?d? ?ch? mma d? iche iche, uru na ?gh?m d? na nke ?b?la nakwa ?z? ?ch? mma si akwalite obibi nd? nd? mmad? ? kachas? ?m?agb?gh? nd? tozuworo ihe e ji nwaany? eme. Nch?cha a b? nke ga-akp?lite ag?r? ?ch? mma ?d?naala Igbo d?ka otu ?z? e si akwalite omenaala Igbo; a gbasoro usoro nch?cha nd?z?ma ebe e weere at?t? nch?cha agb?r? d?ka ebe mgbakwasa ?kw?. Njirime nch?cha a b? ?m?ada Igbo nd? na-ag? akw?kw? na Mahadum Alex Ekwueme nke Ndufu-Alike Ikwo na Steeti Eb?nyi. Nch?cha a ch?p?tara na ?ch?ch? mma malitere n’oge gboo. Njiach?mma nd? gboo na-eme ka ah? gbasie mmad? ike, akw? m?r?m?r? ma d? ?g? na anya. Ha g?nyere: nzu, odo, ?kpaliko, uhie, uli na ihe nd? ?z? a na-enweta n’osisi na ala nakwa ejiji d? iche iche. Njiach?mma nd? agba ?h?r? b? nd? sitere n’aka nd??cha; e jikwa ?t?t? ihe emep?ta ha ebe ?t?t? n’ime ha na-ebute ?nya ál??là na ?r?a d? iche iche. Nch?cha a ch?p?takwara na ?m? nwoke na-ach?kwa mma n’?d? nke ha mana nd? tara isi ya b? ?m? nwaany?, ? kachas? ?m?agb?gh?. Oke ntecha na-emechu nwaany? ihu ? kachas? ebe nd? na-etorubegh? n?. ?ch? mma d? mkpa n’ezina?l? ?b?la n’ihi na ? na-akwalite mmek?r?ta di na nwunye ma si ?z? ah? kwalite obibi nd? ha. A na-emepe obodo site n’?ch? ya mma. Nd? ?ch?cha t?r? aro na ? ga-ad? mma ma a kwalite ngwaa njiach?mma Igbo site n’?gba ha na mkp?? ma mee ka ? d? mfe iji gaa njem; site otu ah? kwalite ak?na?ba, az?mah?a na omenaala Igbo.

Keywords: al?mdi, d?ka, ?ch?, igbo, maka, mma, ngosip?ta, ntozuoke, n’ala, ?m?agb?gh?
Copyright © 2026 ACJOL.